ỊGBA NDỤ N’OBODO ỤFỌDỤ N’ALA IGBO: NZIPỤTA AGBAMNDỤ N’AGỤMAGỤ IGBO NDỊ A HỌỌRỌ
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
Authors
- Ph.D. Ogochukwu Roseline Ifeka Corresponding author
Abstract
Ụmị EdemedeỌtụtụ nsogbu ezinaụlọ ndị Igbo na-agabiga n‘oge a mere na ha anaghị atụkwasị obi n‘ebeibe ha nọ. Ha na-ahụta onye ọbụla nọ ha nso dị ka onye a ga-eze ndụ. fọdụ ndị isi ụkaọgbara ọhụrụ na-akọnye ndị mmadụ ụjọ n‘ahụ gbasara ibe ha. Nke a kpalitere mmụọnchọcha isiokwu a bụ ―Ịgba Ndụ n’Ala Ig o”. Site n‘ịgba ndụ ka a ga-esi kpọghachi mmụọndị na-eche na ibe ha chọrọ igbu ha maọbụ nye ha nsị. E lebara anya n‘obodo atọ dị n‘ SteetiAnambara: Alọ (Idemmili Saụtụ), Uli (Ihiala) na Ọkụzụ (Oyi), iji zipụta ihe bụ ịgba ndụn‘obodo ndị a họọrọ n‘otu n‘otu. A gbaara ọhanaeze n‘anwụ etu obodo ndị a si eme nke ha,usoro na oge ha ji eme ya. E ji usoro nkọwasị wee mee nchọcha a wee zipụta n‘uju ihe a tụrụanya n‘ịgba ndụ n‘ala Igbo ọ kachasị n‘obodo ndị e ji mere ebe mgbakwasa ụkwụ.