MPỤRỤICHE JI NA NKWENYE NDỊ IGBO
- Open access
- Peer reviewed
- CC BY 4.0
Authors
- PhD Edith Ngọzị Ọnụkawa Corresponding author
Abstract
Ụmị EdemedeNdị Igbo nwere ọtụtụ akụkụ ọdịnala ma nke pụtakarịchara ihe n‘omenala ha bụ ji. E deelaọtụtụ edemede banyere ji n‘omenala Igbo, ma edemede ndị a hiwekarịchara isi n‘emume iriji ndị Igbo. Ka o sila dị, edemede a na-akọwapụta ihe ndị mere ka ji bụrụ mkpụrụ akụkụpụtakarịchara ihe ma bụrụkwa nke ndị Igbo kacha akwanyere ugwu n‘omenala ha. Nchọchaa gbasoro usoro nkọwa ma site n‘akwụkwọ dị n‘ọba akwụkwọ nweta ngwa ọrụ e ji meenchọcha a. Nchọpụta sitere na nchọcha a gosiri na ndị Igbo nwere nkwenye na ji nwereagbara nke ya, tinyekwara ọtụtụ ihe ndi ọzọ ndị mere ya ọpụrụ iche n‘akụkụ ndị ọzọ. Nammechi, nchọcha a kwenyere n‘ezie na ji bụ isi mkpụrụ akụkụ ndị ọzọ e nwere n‘omenalaIgbo. Nchọcha a tụnyere aro ka ndị okenye kụziere ụmụaka ihe banyere mpụrụiche ji nwere,mere e ji a kwanyere ya ugwu