TJS TurboFlux Journal System TurboFlux Journal System

Odibendi

Nnamdi Azikiwe University, Awka, Nigeria

Open Access Peer Reviewed
Research article open Vol. 1 No. 1 (2020)

ỌMỤMỤ IGBO NA MAHADUM ABỤGHỊ ANỌMNÌSÌ

PhD Aloysuis U. Umeodinka · Pages 160-173 · December 15, 2022

Authors

  • PhD Aloysuis U. Umeodinka Corresponding author

Abstract

Ụmị edemedeNchọcha a bụ nke isiokwu ya bụ ―Ọmụmụ Igbo na Mahadum Abụghị Anọmnisi‖. Otu n‘imeebumnuche ndị e ji maka ha eme nchọcha a bụ ịkọwa ihe bụ anọmnisi. Ebumnuche ndị ọzọbụ: ịchọpụta etu ndị na-amụ Igbo si anọ n‘isi, ihe na-akpata ọnọdụ ịnọ n‘isi, ọghọm na-esiten‘ịnọ n‘isi na ihe a ga-emegasị iji wee belata ọnọdụ anọmnisi. Usoro anyị na-agbaso n‘imenchọcha a bụ usoro nchọcha kenkọwa nkịtị (descriptive research) na usoro nkọwakesọvee/usoro nkọwa keajụjụ ọnụ (descriptive survey research). Atụtụ nchọcha a bụ nke ikeagbụrụ (Ethnolinguistic vitality theory) na atụtụ njumafọ onwe (theory of self-esteem).Nchọpụta nke mbụ bụ na ụmụakwụkwọ ngalaba Igbo amatachaghị uru dị n‘amụmamụ ha.Nke ọzọ bụ na onye ọbụla gara mahadum bụ asambo digrii ka ọ na-achọ, etu ahụ ka ọ dịkwaonye na-amụ Igbo. Ya bụ na ọrụ na-eche onye mụrụ ihe ọzọ na-echekwa onye mụrụ Igbo. Achọpụtakwara na nchịkọta ihe a na-akụziri ha gbadokarịrị ụkwụ na sayensi asụsụ, nzikọrịtaozi, kọmputa, amụmamụ na omenala.

How to cite

No formats match your search.

Pick a style from the searchable list. Download uses the format currently selected.

Reference managers: RIS · BibTeX · EndNote

In-text (APA): (Umeodinka, 2022) · Umeodinka (2022)